Home / News From Nigeria / Breaking News / ICAM Ga-awa JI!!!!
yam festival

ICAM Ga-awa JI!!!!

N’ụbọchị Satọdee, Ahịa Afọ, n’ọnwa asatọ (Ọgọstụ), n’abalị ishi, Igbo bụ Igbo bi na Michigan ga-awa ji site n’ọgbakọ Igbo Cultural Association of Michigan (ICAM). Ihe ukwu ga-eme n’ụbọchị ahụ. Ji ga-adọrọ n’ite ma dọrọkwa n’abọ. Mmanya ga-adọrọ n’udu dọrọkwa n’ebele.Ụmụnwanyị, ụmụntakịrị, ndị okenye, na ọgbakọ ndị Igbo dị iche iche ga-egosi nke ha jiri biri.Ịwaji nke afọ a ga-akpọtụ akpọtụ. Onye ọbụla were anya ya bịa leere! Ndị Dream Team ga-egbu agụ!

N’ala Igbo anyị na-eri ji n’ụzọ dị iche iche.

Anyị na-asụ ya n’ikwe/odo ka nri ji!
Anyị na-ahụ ya n’ọkụ (Chaị, echetala m ụtazi, ose na mmanụ ọhụ)


Anyị na-esi ya n’ọkụ!
Anyị na-eghe ya eghe!
Anyị na-akwọ ya akwọ wee nwee ike see ya ese!

Ji bụ Eze nri n’ala Igbo nile.
Nwoke na-enweghị ọba ji bụ ogbenye (Gaa gụọ maka Okonkwọ n’akwụkwọ ‘Things Fall Apart’).
Ọba ji ka nwoke jiri kaara ibe ya na gboo!


Nwoke nwere ọba ji na-enwe ọtụtụ ụmụaka ga-enye aka n’ugbo.
Nwoke karịrị ibe ya n’ụba ji na-aza Ezeji!

Biko ka anyị kwụsị n’ebe a. Ka anyị dowee ya n’ebe Ụmụodo dowere ihe ma gaa n’ukwu aṅara ga-aṅa ntị.

Chukwuemeka Uche

Arịreri-mba

About chucks

Viral Video

Support Ooduarere

SUPPORT OODUARERE
Scan QR code below to Donate Bitcoin to Ooduarere
Bitcoin address:
1FN2hvx5tGG7PisyzzDoypdX37TeWa9uwb
x

Check Also

oputa2

Maggi Anwuli Oputa: Nwa nwanyi nwa nwoke Charly onye bu Onye newulite anu aru ma burukwa nne nke umu asaa.

  Maggy Anwuli Oputa bu nne nke umu asaa mana anuaru ya adokachala, O bu onye newulite anuaru. Nna ya Charly Nwoke, Onye bu nna Ogbe, Kere foto Maggy na asomumpi nke ndi newulite anuaru we dee Ihe a: Adaeze m a amuru umu asaa? Mana negodu afo ya. Ndi be Oputa nwere agburu did itunanya.