Home / News From Nigeria / Breaking News / Dimkpa Agụ m: Ndewo!
ndewo

Dimkpa Agụ m: Ndewo!

Ụwa dịwakwara gị mma-oo! Biko, onye adakwala mba n’ihe gbasara asụsụ Igbo ka ewu ghara ịta anyị igu n’isi. Onye gbuwe achara onye gbuwee, onye akpọla ibe ya onye ikonyi. Onye ọbụla ahụla etu nwanne anyị, Abraham Madụ, ji-agbalị n’okwu Igbo, ma aghaara otu onye ụwa, ihe ụwa na-anyịgbu ya. Ma Chukwu ekwekwala!

Biko, onye ọbụla jisie ike! Njem ka dị anya! Onye chetara ife n’Igbo, biko ya fee ya! Onye ọbụla jisie ike nọrọ na nkwadebe maka mmemme ndị Igbo na-eme n’Igbo Village n’afọ abịa abịa. Onye chọrọ ịmụta Omenala Igbo, ya bịawa n’ebe ahụ! Ndị CISA na-agbalị nke ukwu ịkwalite Omenala na Asụsụ Igbo. Ndị CISA na-akụzi etu esi atapị okwu Igbo n’eleghị anya n’azụ. N’afọ gara aga, ha kpọtara ndị Ọkacha maara – Archbishop Obinna (Nke Odenigbo) na Prọfesọ Ejiọfọ (Nke Sụwa Igbo) n’Igbo Village. Ndị ọzọ nọ na nkwadebe maka afọ 2016! Bịa ka ị were anya gị hụụ ike ndị CISA na-akpa n’Igbo Village dị n’obodo Staunton, Virginia. Omenala ndị Igbo na-arị ibe ha elu. Mmemme Omenala nke 2016 ga-adanye n’ọnwa Julaị 28-30.

Ngwa, ka ọ dị! Dịka ị kwuru, ka anyị na-aga n’ubi ka ji na-aka!

Chukwuemeka Uche
Arịrịeri-mba

About Lolade

Viral Video

Support Ooduarere

SUPPORT OODUARERE
Scan QR code below to Donate Bitcoin to Ooduarere
Bitcoin address:
1FN2hvx5tGG7PisyzzDoypdX37TeWa9uwb
x

Check Also

Amotekun Effect Ripples as Igbo Group Gives 90 Days To South East Governors To Launch Security Outfit

Amotekun Effect Ripples as Igbo Group Gives 90 Days To South East Governors To Launch Security Outfit

The National Working Committee (NWC) of the Igbo National Council (INC), an Igbo socio-cultural group has issued a 90 days ultimatum to the governors of the southeast zone to inaugurate their very own regional outfit. Reading a communiqué following a meeting well attended by members from 20 states, the National President of INC, Chilos Godsent stated that the group also condemned what it described as the “naked cowardice exhibited by the governors of the South-East geopolitical zone on the failures ...